Etu e si hibe iwu a na-ese okwu n'Imo
Onye ndụmọdụ onyeisi ndị omieiwu n'Imo steeti banyere mgbasa ozi bụ Emeka Ahaneku gwara BBC na iwu na-ese okwu na steeti ahụ abụghị iwu ọhụrụ.
Maazị Ahaneku sịrị na ọ bụ n'ọchịchị Emeka Ihedioha - bụ onye ụlọikpe ukwu na Naịjirịa chụtụrụ n'ọchịchị - ka iwu a malitere njem.